Uncategorized
ONYE IGBO ONYE ALAKỤBA A GA-EMERINWU NA NHỌPỤTA N’ALA-IGBO? – UTHMAN ỊSA TOCHUKWU


“Onye Igbo bụ onye Alakụba a ga-emerinwu na nhọpụta n’Ala-Igbo?”
Ihe a bụ ajụjụ ótù nwaamadị, Alahaji Uthman Isa Tochukwu jụrụ n’ọba ozi mmekọrịta Twitter nke na-ada okwu.
Uthman kwuru sị, “A bụ m onye Igbo. Nne na nna m bụ ndị Enugwu Steeti, ndi Okpuru Ọchịchị Ndịda Igbo-Eze kpọmkwem.
A mụnyere anyị n’usoro okpukpere chi ndị Alakụba. Gịnị gbochiri m ịzọ ọkwa ọbụla masịrị m n’Enugwu bụ Steeti m?
Site iwuala Naịjiriya, e tozuru m etozu ịzọ ọkwa masịrị m.
E kkwesịrị inwe mkparịta ụka banyere okwu a”
Hmm, ka m jukwaa, nwokorọbịa a bụ ọkaiwu pụta echi ịzọ ọkwa dịka Gọvanọ Enugwu Steeti ma ọ bụ ọkwa ọzọ, a ga-enyekwa ya nkwado ka a ga-eji maka na ọ bụ onye Alakụba jụ ịtụnyere ya?