AKỤKỌ ỤWA
ONYE INYEAKA ỤMAHỊ AGBAALA ARỤKWAGHỊM MAKA DI YA


Abakiliki: Orịaku Emerald Udeaka, Onye Inyeaka Gọvanọ Devidi Ụmahị nke Ebọnyị Steeti n’okwu Nkwalite akụnụba agbaala arụkwaghịm maka di ya, iji zọpụta alụmdi na nwunye ha.
N’akwụkwọ ozi o zigaara Gọvanọ Ụmahị site n’aka Odeakwụkwọ nke Gọọmentị Steeti ahụ, Udeakaji kwuru sị, “Ọ bụghị na m enweghị afọ ojuju n’ihe ọma nile i meere m, kama a chọrọ irubere di m isi etu akwụkwọ Nsọ siri kwụ. Biko, nagide m maka ụmụaka m”
Ihe butere okwu ahụ bụ na di nwanyị ahụ gbanyesiri mgbọrọgwụ ike na òtù ndọrọndọrọ ọchịchị PDP na Steeti ahụ. Ka Ụmahị bara APC, di ya sị ya họrọ ịgba arụkwaghịm n’ọrụ Ụmahị, ebe Ụmahị chọrọ ka ndị ọrụ ya nile soro ya baa APC, na ya onwe ya ịgba ya alụkwaghịm dịka nwunye ya.