AKỤKỌ ỤWA

ONYE MWAKPO EJIRILA MMA GBUO NWA AFỌ ITOLU CHỌRỌ ỊKWỤSỊ YA IDINA NNE YA N’IKE

Indoneshiya: Òtù nwatakịrị nwoke dị afọ itoolu ka onye mwakpo bịara idina nne ya n’ike ji mma were gbujaa ka ọ na-azọ nne ya n’abalị itoolu nke ọnwa Ọktoba, afọ a na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Aceh, Indoneshiya.

Ka nna ya gawara ọrụ, nwatakịrị ahụ si n’ụra kulie hụ nwoke ahụ na-awakpo nne ya. Ọ na-eti “Kwụsị! Kwụsị!!” na-ejide onye arụrụ ala ahụ, onye gbuziri ya, buru ozu ya tunye na mmiri.

Ndi ọrụ nchekwa mechara jide ya bụ ogbu ọchụ, aha ya bụ Samsul ma gbakwaa ya egbe n’ụkwụ ka ọ chọrọ ịgbalaga.

Inspector Arief Sukmono Wibowo, Onyeisi ndị Uwe Ojii n’ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii na Langsa kwuru na ya bụ onye a na-ebo ebubo ka si na nga pụta ebe ọ nọchara afọ iri n’ise maka igbu ọchụ.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close