ONYE NCHE FULANI ADA JIZỌS GBURU YA BURU ỤGBỌALA YA GBALAGA

Asaba : Nwa-ada Oby Onakanse (Ada Jizọs) ka onye nche ya onye Fulani gburu, lie ma buru ụgbọala ya gbalaga.
Ada Jizọs, onye gbara afọ iri atọ n’isii ma bụrụkwa onye Ukwu-Nzu dị n’Okpuru Ọchịchị Mgbago Ugwu Aniocha, Delta Steeti ka Idris Haruna, onye nche ụlọ ya kụgburu kemgbe ihe karịrị otu ya n’azụ ụlọ ya.
Ka ọ gachara ihe karịrị otu izu ụka e ji achọ nwanyị ahụ achọ, aka kpaara onye ogbu ọchụ ahụ n’ọdụ mmanụ ụgbọala ka o bu ezinụlọ ya n’ụgbọala Lexus Jeep nne ya ukwu bịa ịgbara mmanụ ụgbọala.
Kaosiladi, ndị mmadụ bidoro inyo ya enyo oge o nweghị ike imeghenwu udu mmanụ ụgbọala (fuel tank) nke ụgbọala.
Ka a jụrụ ya maka nne ya ukwu, o bidoro tagheriwe ọnụ nke mere e ji kpụrụ ya laghachi be nwanyị ahụ.
Ndị mmadụ hụrụ na ọbara fesachara na mgbidi ụlọ ahụ. Idris kụziri eziokwu ma gozikwa ebe o liri Ada Jizọs. Ọ kpọkwara otu onye bi n’ụlọ ahụ dịka onye aka ya dị na ya bụ igbu ọchụ.
Ụjọ na-atụ ụmụnne nwanyị a na ha agaghị enweta ikpe Nkwụmọtọ n’ọnwụ ada ha nwanyị maka na Kọmishọna ndị Uwe Ojii nakwa ndị ji okwu ahụ bụ ndị Fulani.
Hmm, nsogbu ụwa. Bikonu, ndị na-akpọta ndị nche ndị Fulani kpacharanụ anya.



