AKỤKỌ ỤWA

ONYE NKUZI EJIRILA ÍGWÈ KỤGBUO NWATA AKWỤKWỌ YA IJI NYE YA NTARAMAHỤHỤ

Abụja: Aka ndị Uwe Ojii akparala ótù onye nkuzi n’ụlọ akwụkwọ Sekọndịrị Federal Government College, Kwali nọ na Mpaghara Kuje, Abuja, onye tigbụnyụrụ nwata akwụkwọ ya, Yahaya Aliyu, anya ka ọ na-enye ya ntaramahụhụ.

Ozi hoo!haa!! nwetara na – egosi na Aliyu enweghị ike imechanwu nnwale were laa (home work) e nyere ha maka na ahụ adịghị ya, mere o ji gaa n’ogige ahụike ụlọ akwụkwọ ahụ ịga nara ọ́gwụ̀.

N’ihi ya, onye nkuzi ahụ nyere ya ntaramahụhụ, mechakwaa were aka bọketị ígwè kụọ ya n’isi.

Ka onye nkuzi ahụ hapụrụ ya, Aliyu deserve isi ya n’oche. Oge ndị klaasị ya hụrụ na ọ naghị emegharịkwa, ha tiri mkpu.

Kaosiladi, a hụrụ na ọ nwụọlarịị oge e ji buru ya rute n’ụlọ ọ́gwụ̀.

ASP Mariam Yusuf, Ọnụ na-ekwuru ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii n’Abụja kwuru na nnyocha ka na-aga n’ihu banyere okwu ahụ.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close