Uncategorized
ONYE ỌKADA EGBUOLA NWANYỊ O BUTERE MMA, ZUO YA OHI


Ịbadan: Ótù nwanyị onye ajọ chi ka onye ọkada butere ya n’isi ụtụtụ n’Ịbadan wakporo ma zuo ohi.
N’Ịbadan, ndị ọkada na – ebu mmadụ abụọ. Nwanyị ahụ gbara ụzọ gaa ime ndebanye aha maka akara NIN amaghị na onye ọkada ahụ na onye nke abụọ o bu bụ ndị ohi.
Ka ha pụtara n’ụzọ, nwoke nke ọzọ sịrị ka ọ rituo. Ọ rịturu mịpụta mma ogbuadana. Ha abụọ wakpoziri nwanyị ahụ ma gbuo ya mma n’ihu ebe na-azọ ekwentị ya na akpa ya.