ONYE UWE OJII MADORO M AFỌ N’ALA N’IHU NDỊ M NA-ACHỊ – EZE ỤMỤNA KPESARA KỌMISHỌNA NDỊ UWE OJII N’IMO


Owere: Eze B. C. Okereke, Eze Ọdịnala Ụzọubi, Ụmụna dị n’Okpuru Ọchịchị Ọ́lụ̀ n’Imo Steeti edegarala Kọmishọna ndị Uwe Ojii na Steeti ahụ, Nasiru Mohammed akwụkwọ mkpesa maka mkparị na mmekpa ahụ ọ natara n’aka ótù onye Uwe Ojii n’ụbọchị Wenezdee, abalị atọ nke ọnwa a bụ Febrụwarị afọ 2021.
Onye eze ahụ kwuru na n’agbanyeghị ekike ya dịka eze Ọdịnala, akara ụgbọala ya gosiri na ya bụ eze Ọdịnala tinyere na ya emeela agadi, na onye Uwe Ojii ahụ gara n’ihu nye ya oke mkparị nakwa ntaramahụhụ site ị hụna ịtụdo ya égbè mee ka ọ mado afọ n’ala n’okporo ụzọ n’ihu ndị ọ na-achị.
Nke ahụ mere oge e nwere ọgbaghara n’Ọ́lụ̀ n’agbanyeghị na onye eze ahụ kọwara na ya si ọgbakọ.
Eze Okereke onye rịọrọ Kọmishọna ndị Uwe Ojii ka o lebanye n’okwu ahụ kwara arịrị n’ihi na onye Uwe ojii ahụ bụ onye ugwu agaghị emenwu Emịya, ya bụ Onye Eze Ọdịnala ndị Ugwu Awụsa udiri akaja ahụ.