OPC AGWALA NDIGBO KA HA KWÀDÓÓ NDỊ ESN


Ịbadan: Òtù Oodua Peoples Congress (OPC) enyela Ndigbo ndụmọdụ ka ha òtù nchekwa ESN iji hụ na ha chụtere ndị nchị ehi Fulani aka n’Ala-Igbo.
Odeakwụkwọ Mgbasa Ozi òtù OPC, Ọkaiwu Yinka Oguntimehin kwuru nke a na ngwụcha izu ụka a gara aga.
O kwupụtakwara na ha kwụ òtù nchekwa Amotekun n’azụ chịm chịm na mbọ ha na-agba n’ala Yoroba iji belata mkpa mkpa ndị nchị ehi ndị Fulani na ndị omekome ndị ọzọ na – akpa n’ebe ahụ.
Oguntimehin rụtụru aka na etu Amotekun sịrị nwụchikọọ ndị Almajiri mmadụ iri n’anọ zokpuru n’azụ gwongworo were chọọ ịmịbata n’Osun Steeti nakwa ọmalincha aka ọrụ ha na Oyo Steeti.
Hmm, ESN dịkwa mma inye nkwado mana e nwere ihe a na-ewepụ n’anụ were eri anụ. Ọ dị mkpa na ndị okenye Ala-Igbo, ọ kacha mmadụ atọ Ohanaeze Veterans họpụtara bụ Bishọọpụ Obi Onubogu, Ọkammụta T. U. Nwala na Ọkammụta Elo Amucheazi ga-enwe mkparịta ụka miri emi, ha na ndị isi IPOB, iji were hụ na ihe niile gara n’usoro ya.
Ọbụladị ndị OPC na ndị okenye, ndị Ichie ala Yoroba nwere nghọta ma werekwa anya na – agba izu. “Ụzụ amaghị akpụ ogele…”