ỌRỊA KỊTỊKPA ÈNWÈ ABATAWO ANAMBARA




Ọka: Ọrịa Kịtịkpa Ènwè a na-akpọ “monkey pox” na Bekee abatawo Anambara Steeti.
Ozi si n’aka Dọkịnta Afam Obidike, Kọmishọna na-ahụ maka Ahụike na steeti ahụ na – ekwu na mmadụ abụọ ebutewo ya bụ ajọ ọrịa, ebe a na-eme nnyocha banyere ọrịa ahụ n’Okpuru Ọchịchị atọ gụnyere Ọwụwa Anyanwụ Anambara, Ọnịcha na Oyi.
Obidike kọwara na mịnịstrị ya ekeela nkwụcha iji hụ na ọrịa ahụ agbasaghị Steeti ahụ nile.
O gwakwara ndị bi na steeti ahụ ka obi ghara ịmapụ ha ma ha chọpụta na o nwere ihe na-etukasị ha n’ahụ kama ka ha gbaga n’ụlọ ọgwụ maka nnyocha ahụike kwesịrị ekwesị.
“Izu ụka ole na ole gara aga, e nwetara ozi na o nwere mmadụ atọ a na-enyo enyo ma ha ebutere ọrịa Kịtịkpa Ènwè. Onye nke si Okpuru Ọchịchị Ọwụwa Anyanwụ Anambara, onye a chọpụtara bu ya n’eziokwu nọzị ugbua n’Ogige Nkewapụ nke Ụlọ Ọgwụ Mahadum Nnamdi Azikiwe, Nnewi.
“Gọvanọ Chukwuma Soludo ejiriwo maka ya bụ ndapụta ọrịa were nọrọ ụbọchị Wenezdee kpọọ ọgbakọ Kọmitii ọrụ ngwa ngwa.
“Ndị bịara ọgbakọ ahụ gụnyere ndị si òtù ahụike mbaụwa dị iche iche dịka òtù World Health Organisation, WHO na òtù United Nations International Children’s Emergency Fund, UNICEF.”
Hmmm, “Kịtịkpa kwa?” Nsogbu akarịa!
“In light of the above, Governor Charles Soludo has declared the incident an outbreak, and an emergency preparedness and response committee meeting was convened on Wednesday. The meeting was attended by relevant stakeholders, including World Health Organisation (WHO) team and the United Nations International Children’s Emergency Fund (UNICEF); they are providing necessary assistance to the state.