AKỤKỌ ỤWA

ỌRỊA KORO: YIRI MKPUCHI IHU TUPU NSUSU ỌNỤ

Ndị ọkachamara ekwuola na ndị na-enwe mmekọahụ kwesịrị iyi mkpuchi ihu (face mask) ma zekwaara isusu ọnụ iji gbalahụ ibute ọrịa koro.

Dọkịnta Teriza Tam, Onyeisi Nlekọta Ahụike nke mba Kanada kwuru nkea ụbọchị Wenezdee a.

Tam kwukwara na mmadụ ịnọrọ onwe ya n’enweghị mmekọahụ ọbụla kacha mma n’oge ọrịa nfesa mba ụwa a bụ ọrịa koro.

“Ọ hịara nnukwu ahụ bụ mmadụ ibute ọrịa koro site na ihe na-apụta n’ahụ nwoke na mmekọahụ (semen) ma ọ bụ nke na-apụta n’ahụ nwanyị (vaginal fluid).

“Kaosiladi, ohere ibute ọrịa a ga-aka dị elu oge mmadụ na onye ọ matara ọhụrụ nwere mmekọahụ, ọ kacha ma ha mee nsusu ọnụ”

Tam kọwara na dịka e si ebelata ihe ọbụla ga-ebute mmadụ na ibe ya imetụta ahụ maka igbalahụ ibute ọrịa koro, na ọ dịkwa mkpa izere ihu na ihu imetụta oge a na-enwe mmekọahụ.

N’ihi ya, o nyere ndụmọdụ ka ndị na-enwe mmekọahụ zeere nsusu ọnụ, zeere imetụta ihu, yiri mkpuchi ihu ma leruo onye òtù gị anya tupu unu amalite inwe mmekọahụ, iji chọpụta ma o nwere ihe ịrịba ama ọrịa ahụ.

Kaosiladi, ụfọdụ ndị o ji na njọ kọwazịrị okwu ya n’udiri iyi mkpuchi ihu were na-eme nsusu ọnụ.

Hmm, ndị mmadụ dị egwu! Kedụ kwa nke bụ iyi mkpuchi ihu were ata nsusu? Nkea aga ekwe omume? Kama nke ahụ, a tachaa nsusu ahụ, e mee “n’afa nna”, ṅụkwaa mmiri nsọ

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close