AKỤKỌ ỤWA

OSIMHEN EKWETAWO ITINYERE CHELSEA AKA N’AKWỤKWỌ MKPEBI NCHEREOGE

Viktọ Osimhen,nwa-afọ Naịjiriya bụ ọ̀gbáihu ndị ótù egwu bọl ‘Super Eagles’ Naịjiriya nakwa Napoli nke mba Itali, ekwetawo ịga Chelsea na ngwụcha àgbà asọmmpi 2023/2024.

Nchọpụta akwụkwọ akụkọ Punch mere na-egosi na ya bụ nwaamadị dị afọ iri abụọ na ise, onye bụkwa ọkaibe egwu bọl mba Afrika nke afọ 2023, onye ego ntọhapụ ya na Napoli ruru otu narị Pound na iri na abụọ (£112m), agaghị apụ n’ohere azụmahịa nke Jenụwarị a. Kaosiladị, o kwetawo itinyere Chelsea aka n’akwụkwọ maka isonye ha na ngwụcha àgbà asọmmpi 2023/2024.

Ozi ahụ kwukwara na ndị dịka Didier Drogba na Jọn Mikel Obi, odogwu abụọ gbaara Chelsea, so ‘agba ya ọ́gwụ̀’ ka o kweta.

O teelarịị Chelsea ji achọ ịzụta onye ọ̀gbáihu aka siri ike, Osimhen bụkwa onye mbụ ha bu n’obi.

Onye ọzọ Chelsea chọkwara bụ Ivan Toney mana afọ ole ọ dị nakwa oke ọnụ ahịa ya bụrụ ha ọ́gbàtáùhìè.

Ya bụ odogwu ótù egwu bọl Napoli dị nkwadebe ịga Lọndọn mana ya bụ mkpebi nchereoge bụ ihe ga-eme ka Chelsea mara na “ọ́nyà ha amatawo anụ”.

Osimhen adịbeghị anya o tinyere aka n’akwụkwọ mkpebi ọhụrụ nke nyere Napoli ego gbara ọkpụrụkpụ, tinyere £112m dịka ego ntọhapụ bụ nke ha ga-ana ma Osimhen chọrọ ịpụ n’ọnwa Jenụwarị a.

Ọtụtụ ndị mara nke ékwé na-akụ banyere egwuregwu bọl n’Itali na-atụ anya na ahịa ga-azụ n’ime izu ụka ole na ole nọ n’ihu. O dokwara ha anya na ihe a ga-abụ àgbà asọmmpi ikpeazụ Osimhen na Napoli.

A na-akwanyekwa Chelsea ọkụ n’ike ka ha ghara igbu oge ọbụla maka na “e mee ngwa ngwa, e meghara ọdachi”. Ọ gbanahụ ha ugbua, ọtụtụ ótù egwuregwu ndị ọzọ ga-azọ ya bụ nwaamadị ọ́kpà na-àhọ́ nkọ azọ ma ha chewe oge azụmahịa udummiri (Summer).

Osimhen ga-eso n’ime ndị ọgba bọl Chelsea kacha eri ụ́gwọ, ma o sonye ha n’oge udummiri a.

Hmmm, Chelsea mara asụ, ha asụọ n’íkwè.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close