Uncategorized
ỌTANÍSHÍ TINUBU: AZỌPỤTAWO NWA AGBỌGHỌ OWERE CHỌRỌ IWỤKPU N’OSIMIRI NWAORIE, GBUO ONWE YA


Owere – N’ụbọchị Wenezdee, njiji kara iji na njekọrịta ụzọ Warehouse n’Owere, oge otu nwagbọghọ (ekwughi aha ya) chọrọ igbu onwe ya maka Ọtaníshí Tinubu.
Ya bụ nwata nwagbọghọ chọrọ ịwunwe n’Osimiri Nwaorie tupu ndi nọ nso ebea jiri gbata jide ya.
Ọ na -esi ọnwụ ka a hapụ ya ka ọ wụbanye n’ime mmiri ahụ, ka mmiri rie ya, na ike ụwa agwụwo ya.
Ndi obi ebere nọ nso ebe ahụ nyeweziri ya bụ nwata, onye a sị tara ahụ nke ukwuu site na agụụ, ihe ọṅụṅụ dị iche iche ka o were nweta onwe ya, oge o koropuru.