MMEMME

ÒTÙ NKWALITE ASỤSỤ IGBO WIKIMEDIA FAN CLUB ENWEELA ỌGBAKỌ NRỤPỤTA NKỌWA OKWU

Ọka: Òtù a kpọrọ igbo wikimedia fan club anọrọwo ụbọchị Tuuzdee na Mahadum Nnamdi Azịkiwe, Ọka were nwee ọgbakọ nrụpụta nkọwa okwu na wiki data.

Lexicography bụ nhazi/ndezi na ndebanye mkpụrụokwu n’ụdị akwụkwọ nkọwa okwu ( the process of writing, editing and creating a dictionary).

N’oge ahụ, Onye isi òtù ahụ bụ Oriakụ Ọbịageli Ezeilo kọwara
ihe bụ lexicography nakwa otu esi eme ya site n’iji igwe kọmputa na ekwentị.

E ji igbu ọjà mara ụmụ nwoke. Kaosiladị, ogbu ọjà nwanyị, Nwaada Somtochukwu gburu ọja pụrụ iche na mmemme ahụ ebe Oriakụ Ọbịageli Ezeilo tụkwara mpete.

Oriakụ Edith Nwaobu, onye nkuzi na ngalaba asụsụ Igbo na mahadum ahụ ji ohere ahụ gwa ụmụ akwụkwọ na ndị ọzọ bịara mmemme ahụ ka ha gbasie mbọ ike ịhụ na asụsụ Igbo bawanyere.

Ndị ọkachamara akọwaala na udiri ọgbakọ a dị oke mkpa maka nkwalite asụsụ Igbo

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close