Uncategorized

Otu NSE ngalaba Enugwu ahọpụtawo Oriakụ Ụjam dịka Onyeisi oche ha mbụ bụ nwanyị

Enugwu – Òtù Nigerian Society of Engineers (NSE) ngalaba Enugwu nọrọ n’ọgbakọ ụkwụ kwa afọ ha nke afọ 2020 were họpụta Oriakụ Uchenwa Ụjam, FNSE dịka Onyeisi oche ha mbụ bụ nwanyị.

Na nhọpụta e mere ụbọchị Tọọzdee gara aga n’ụlọ ezumezu STVMB dị n’Ogwuiyi, Enugwu, Ụjam nwetara akara 61,ebe onye ya na ya zọrọ ọkwa ahụ, Mazị Chibụzọ Aka nwetara akara 29.

N’okwu nnabata ya ka a họpụtachara ya, Oriakụ Ụjam kelere ndị òtù ahụ nile, ndị sonyere na ya bụ nhọpụta, ma ndị tụnyere ya ma ndị n’atụnyeghịrị ya.

“Na mbụ, a na m enye Chineke ekele ma na ekelekwa unu nile maka etu unu sịrị họpụta m.

“Ekele m na-agaara ma ndị tụnyere ma ndị n’atụnyeghịrị m. Mmeri m bụ mmeri ndị òtù anyị nile.

“Dịka nne, o nweghị onye m ga-eleghara anya”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close