ÒTÙ ỌHANAEZE VETERANS ÁKWÀDÓÓLA MKPỌLITE N’ỌKWA NDỊ ÒTÙ ACHBISHỌỌPỤ OBINNA IJI MEGHARỊA NHỌPỤTA ỌHANAEZE


Enugwu: Òtù Ọ̀hanaeze Veterans ekwuola hoo!haa! na ha kwadoro mkpọlite n’ọkwa ndị Concerned Imeobi Members kpọlitere Achbishọọpụ A. J. V. Obinna na ndị Bishọọpụ Ndigbo ndị ọzọ dịka Kọmitii ga-emegharị nhọpụta Ọhanaeze Ndigbo.
N’ozi sitere n’ọgbakọ mbụ ha nke ha nwere n’Enugwu ụbọchị Satọdee gara aga, nke Mazị Ikechukwu Bismarck Ọjị na Ndubuisi Igwekala tinyere aka n’aha ndị ọzọ, Ohanaeze Veterans kwuru na ụzọ nhọpụta Ọhaneze abụọ e mere na nkewa, ma nke ndị òtù Prins Rịchaadị Ozobu mere n’Enugwu ma nke òtù Ichie Gary Igariwey mere n’Owere, enweghị nke nwere isi ebe ha agbadoghi ụkwụ n’usoro iwu Ọhanaeze.
Ozi ahụ kọwara òtù Ọ̀hanaeze Veterans dịka òtù jikọtara ndị ndu Ndigbo, ndị nọworo n’Ọhanaeze Ndigbo ihe dịka ọgụ afọ were na-agba mbọ maka ọdịmma Igbo.
N’ọgbakọ ha nwere na Zoom ụbọchị ụka gara aga, Onyeisi Oche Concerned Imeobi Members bụ Ichie Ụma Eleazụ kọwara na ha na-akpọlite ọgbakọ ndị Bishọọpụ Ndigbo ka ha bịa kpaa udo site na ịhụ na e doziri ihe nile etu kwesịrị ekwesị iji hụ na a chịkọbara nhọpụta ọhanaeze ziri ezi.
Ndị Ọhanaeze Veterans jikwa ohere ahụ were kpọkuo ndị nile bụ Ndigbo chọrọ ọdịmma Igbo ka ha dọnyere òtù Kọmitii nchere oge ndị Bishọọpụ a úkwù iji hụ na a zọrọ òtù Ọ̀hanaeze Ndigbo ndụ.