AKỤKỌ ỤWA

ỌYỌ STEETI EWEPỤTAWO ỤBỌCHỊ ISESE DIKA ỤBỌCHỊ EZUMIKE MAKA NDI ÓMÉNÀLÀ

Ibadan – Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Iwu Ọyọ Steeti ekpebiela imebe iwu nke ga-eme ka ndị omenala na steeti ahụ nwee ụbọchị ezumike nke ha, a kpọrọ ụbọchị Isese.

Cheta na Gọvanọ steeti ahụ bụ Omenala Sheyi Makinde nọrọ n’oge achụmnta nkwado maka nhọpụta gara aga were kwee ndị usoro okpukperechi omenala na steeti ahụ na ọ ga ehiwere ha ụbọchị ezumike nke ha, etu ndi ụka siri nwee Ekeresimesi, ndị Alakụba nwee Salah, maka na “e mee nwa ka e mere ibe ya, obi adị ya mma”

Ndị welitere okwu ahụ n’ihu ụlọ nzukọ Omebeiwu ahụ gụnyere Hon. Sanjo Onaolapo(Ogbomosho Ndịda), Hon. Gbenga Oyetola(Atiba) na Hon. Gebrel Akinjide (Mgbago Ugwu Ibadan II).

Oge ọnụ na-ekwuru Ụlọ Nzukọ Omebeiwu ahụ, Rt. Hon Debo Ogundoyin, kpọrọ ókù ịma mmadụ ole kwadoro ya bụ mkpebi, mmadụ nile kwadoro ya nke mere ha kpọọ ókù ka Gọvanọ Makinde gaa n’ihu hiwezie ụbọchị Isese dika ụbọchị ezumike nke ndi omenala na steeti ahụ.

N’ịga n’ihu n’okwu ya Hon. Onaolapo, onye nke bụkwa Onye ndú nke Ụlọ Nzukọ Omebeiwu ahụ kwukwara na ọtụtụ steeti ndị ọzọ na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Ala anyị ewepụtalarịị abalị iri abụo nke ọnwa Ọgọọstụ dịka ụbọchị Isese.

Ọ kọwara nke a dika ihe dị mkpa iji kwalite omenala ndi Yoroba.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close