AKỤKỌ ỤWA

ỌZỌKWA! NDỊ FULANI AWAKPOWO EHA-AMUFU, GBUO OPEKATA MPE MMADỤ ISII, TINYERE NWANYỊ DỊ IME

Enugwu: Opekata mpe ozu mmadụ isii ka e buteworo ka ndị omekome ndi Fulani wakporo Eha-Amufu dị n’Okpuru Ọchịchị Isi-Ụzọ n’Enugwu Steeti ụbọchị Tọzdee.

Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na ndị Fulani ahụ wakporo Mgbuji nakwa Ebo dị n’Eha-Amufu, n’ebe elekere atọ nke ehihie were gbuo mmadụ isii, tinyere ótù nwaanyị di ime.

A na – achọ kwa ọtụtụ mmadụ achọ, ebe ha gbakwara ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ na ọgbatumtum ọkụ.

Nsogbu malitere oge ụfọdụ ndị ntorobịa obodo ahụ chụpụrụ ndị nchi ehi hapụrụ ehi ka ọ mebie ugbo akpụ ndi obodo ahụ.

Oge ahụ, ndị ntorobịa ahụ gburu ehi ole ole mere omekome Fulani ahụ jiri wakpo ha.

Otu onye obodo ahụ kwuru na ndị soja na-eche obodo ahụ nche buru ụzọ pụọ tupu mwakpo ahụ.

“Anyị kpọkuru ndị soja na ndị Uwe Ojii ka anyị nụrụ kepu kepu banyere mwakpo ahụ

Mazi Stiv Ọrụrụọ, onye ndụmọdụ Gọvanọ Enugwu Steeti n’okwu Mgbasa ozi kwuru na Gọọmenti ezigala ndị ọrụ nchekwa ebe ahụ.

Chetakwa na nke a bụ nke ugboro abụọ ndị Fulani na-awakpo, kwafuo ọbara ma yikwaa ndị obodo ahụ n’afọ a.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close