PANPIEC EHIWELA NGALABA ỤMỤ NWANYỊ NA MPAGHARA ỌWỤWA ANYANWỤ NDỊDA


Enugwu: Òtù PANPIEC (Pan Nigerian President of Igbo Extraction) nọrọ ụbọchị Tọzdee were hiwe ngalaba ụmụ nwanyị ya maka mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda Naịjiriya.
Ebumnobi PANPIEC bụ ịhụ na Onye Igbo nwetara ọkwa Onye isi ala na Naijiria n’afọ 2023.
N’okwu ya n’oge ahụ, Mazi Chuks Ibegbu, Odeakwụkwọ Nhazi (Administratve Secretary) kọwara na PANPIEC bụzi òtù ọ ye ọbụla kpụ n’ọnụ.
“PANPIEC bụzi òtù onye ọbụla kpụ n’ọnụ n’okwu banyere ịhopụta onye Igbo dịka Onyeisiala Naịjiriya n’afọ 2023, n’akụkụ Naịjiriya nile. ” Mmemme taa dị oke mkpa maka na ụmụ nwanyị bara nnukwu uru na ndọrọndọrọ ọchịchị. Dịka Nnukwu Onyeisi Ohanaeze Ndigbo laworo mmụọ, Igwe Eze Ọzobu siri kwu ” ụmụ nwanyị na di ntorobịa dị oke mkpa na ndọrọndọrọ ọchịchị”.
Ibegbu, onye jibu ọkwa dịka Odeakwụkwọ Mgbasa ozi òtù Ohanaeze Ndigbo rịọ kwara ụmụ nwanyị ahụ ka ha gbaa mbọ eleghị anya n’azụ iji mejupụta ebumnobi òtù ahụ.
Onye Nlekọta ngalaba ụmụ nwanyị PANPIEC na Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda, Oriaku Lizzy Ojukwu kwupụtara na ya na ndị òtù ya dị nkwadebe ịhụ na onye Igbo weghara ọchịchị dịka Naịjiriya n’afọ 2023.
“Mmegbu a na – emegbu Ndigbo na Naịjiriya karịrị akarị. Ndigbo ka o ruuru ịbụ Onyeisiala Naịjiriya n’afọ 2023.
“Anyị ga-agbasa ozi ọma PANPIEC ebe nile iji hụ na Onye Igbo bụ Onyeisiala Naịjiriya n’afọ 2023”.
Ichie Pat Anyanwụ, ótù onye so ndị isi izugbe òtù PANPIEC nọrọ oge ahụ were gwakwa ụmụ nwanyị ahụ okwu agbamume.
Mazi Ibegbu duziri ụmụ ndị ahụ si steeti ise dị na Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda n’iyi ọrụ.