PASỊTỌ ENUGWU TIPURU NWUNYE YA AFỌ IME NỌZỊ NA NGA



Enugwu– Ụlọikpe Majie n’Enugwu nọrọ ụnyaahụ nye ntụziaka ka a etinye na nga ótù nwaamadị, Ugochukwu Evidence Nwachukwu, onye nke bụ pasịtọ ótù ụka akụrụmaka n’Enugwu, onye tigidere nwunye ya bụ Amaka ihe, tipu ya afọ ime ọnwa ise.
Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na ya bụ ụkọchukwu arụrụala dị afọ iri anọ na atọ nọrọ n’ebe elekere asaa n’abalị irí abụọ na itoolu nke ọnwa Septemba n’ụlọ ha dị n’ógbè Artisan, Enugwu were kụọ nwunye ya “ihe tinker kụrụ pan”
Amaka kwuru na nke ahụ abụghị mbụ di ya ahụ na eti ya ka ọ na-egbu agwọ kemgbe ha gbara akwụkwọ n’ọnwa Maachị afọ a.

“Ihe butere nke a bụ na m gara ekpere ọmụmụ anya abalị kwa ọnwa. Ka m na-achọ ịga, e cheere m ka m gwa ya mana ọ bataghị rụọ elekere iri nke abalị bụ oge m gawazịrị.”
Hmmm, “Okeke nwanyị dịkwa ntị njọ”. Ebe Ụkọchukwu tigidere nwunye ya ihe, tipu ya afọ ime, kedụzi ndụmọdụ ọ ga-enye di na nwunye na-abịa ụka ya, ndị na-enwe nsogbu?