Uncategorized
POOPU FRANSISI JIRI ỌNỤ KWUO EBE Ọ KWỤ BANYERE NDỊ LGBTQ


Vatikan– Kadinal Pietro Parolin, Odeakwụkwọ Ukwu nke Vatikan ekwuola na Onye ndú ụka Katọliki, Poopu Fransisi enweghị oge o jiri kwuo okwu ikwado alụmdi na nwunye ndị LGBTQ (nwoke idina nwoke, nwanyị idina nwanyị, wdg), na a ghọtahiere okwu ya.
Kadinal Parolin kwuru na ihe Poopu Fransisi na – ekwu abụghị maka iwu ụka, kama na ọ bụ maka iwuala mba dị iche iche.
Poopu Fransisi nọrọ n’ajụjụ ọnụ Ụlọ Mgbasa ozi Televisa nke mba Mexico gbara ya n’afọ gara aga were kwuo na “ndị a ekwesịghị ị na-akpa ókè megide ndị LGBTQ, na ha bụ mmadụ. E kwesịrị ịnabata ha n’ezinụlọ”
Kaosiladi, ọtụtụ mmadụ ka na-ajụ ihe mere na Poopu Fransisi agaghị apụta jiri ọnụ ya kọwaa ebe ọ kwụ n’okwu ahụ.