NKE NA-EME UGBUA

SINETỌ IFEANYỊ ỤBA ANWỤỌLA

Sinetọ Ifeanyị Ubah, onye na-anọchiteanya mpaghara Ndịda Anambara n’ụlọ nzukọ Sineti Naịjiriya anwụọla.

Ozi hoo!haa!! nwetara bụ na ọ nwụrụ n’ụlọ ọgwụ na Lọndọn n’isi ụtụtụ taa bụ Satọdee.

Ya bụ nwaamadị na-akwadosi ike iji aha ótù ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) nwere zọọ ọkwa Gọvanọ na steeti Anambara ka a sị nọ n’ụlọ ọgwụ na Lọndọn kemgbe izu ụka ole ma ole. Kaosiladị, ọnọdụ ya kawanyere njọ n’ime abalị abụọ gara aga tupu o kubie n’isi ụtụtụ taa.

Ụba gbara afọ iri ise na abụọ tupu laa mmụọ. Ka mkpụrụ obi ya zuru ike na ndokwa! Iseeeeeee!

Chineke! Ọ gịnịkwa na-emezi n’Ala-Igbo? E tichabeghi mkpu ọnwụ Iwuanyanwụ ọzọ mekwaa.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close