SINETO STEETI IMO ESIWO LP WỤFEE APC



Abụja – Sinetọ na-anọchiteanya mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Imo esiwo n’ótù ndọrọ ndọrọ ọchịchị Labour Party (LP) wụfee ótù ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC)
Onyeisi Sineti Naịjiriya nọrọ taa bụ Tuuzdee were gụpụta akwụkwọ ozi mwụfe Onyewuchi.
Hope Uzodimma, Aka na-achị Steeti Imo ma bụrụkwa Onyeisioche Ọgbakọ ndi Gọvanọ APC bụ Progressives Governors Forum (PGF), nọkwa n’ụlọ nzukọ Omebeiwu ahụ oge ahụ.
Sineto ahụ kwuru na mwụfe ya gbadoro ụkwụ n’isiokwu 68(1g) nke iwuala Naịjiriya.
“Mkpebi mwụfe a sitere n’esemokwu ekweghị ndozi nke na-aga n’ihu n’ótù ndọrọ ndọrọ ọchịchị Labour Party nke m jiri nweta nhọpụta na Sineti.
“Steeti Imo state na Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda kwụdosiri ike n’okpuru onye ndu anyị bụ Gọvanọ anyị na-arụ ọrụ, Hope Uzodimma.”
hmmmmmm! Ọ ihe ọ ga-abụ! Ọ chi nwa agbọghọ ewu mere ka a hụ̀wá ya ọnụ. LP enyewo ohere maka ndị chọrọ mgbalaga.