AKỤKỌ ỤWA

SỌNI-WENIKE, ONYE IKWERE BỤZI ONYEISI ỌHANAEZE NDIGBO SAWỤTỤ AFRỊKA

Ndigbo bi na mba Sawụtụ Afrịka ahọpụtala Mazị Ibojekere Douglas Sọnị-Wenike, onye Ikwere, dịka Onyeisi ọhụrụ nke Ọhanaeze Ndigbo Sawụtụ Afrịka.

Na nhọpụta ahụ e mere ụbọchị Satọdee n’Ụlọ Nnọchiteanya mba Naịjiriya dị na Illovo, Johanesbọg, ndị ọzọ a họpụtara gụnyere Hon Ndụka Udemezue, Osote Onyeisi, Ọkaiwu Jef Azụbụike, Odeakwụkwọ, Mazị Samụwel Obiora, Odebeego, Mazị Josef Mọnde Ogbule, Odeakwụkwọ Ego.

Ndị ọzọ gụnyere Mazị Tochukwu Nwoke, Osote Odeakwụkwọ, Mazị Henrị Monye, Odeakwụkwọ Mgbasa Ozi, Hon Toni Okoro, Odebe udo na Omenka Sọnde Onwe, Odeakwụkwọ Nhazi Mmemme.

Ụfọdụ ndị nwere àgbà bịara mmemme ahụ gụnyere Mazị Abdul Malik Mike Ahmed, Onye Nnọchiteanya mba Naịjiriya na Sawụtụ Afrịka, Ezeali Ndụbụeze Udeji, Onowu Ndigbo na Sawụtụ Afrịka, Ichie Ossy Nwobi, Ezechinyelugo nke mbụ n’Ọ̀gwụ̀ bụrụkwa Onyenwe Fontana Group nakwa Dọkịnta Julius Ọsakwe, Aghaeriọsa n’Aboh, onye rịturu n’ọkwa dịka Onyeisi ótù ahụ.

Ndigbo bi na mpaghara itolu dị na mba ahụ sonyere na nhọpụta ahụ.

Apostle Mike Madụabuchi Ugwu, Onyeisi Oche ótù nhazi nhọpụta ahụ kwupụtara afọ ojuju ya etu ya bụ nhọpụta siri gaa sịrịrị werere

“N’ezie, obi dị m ụtọ etu nhọpụta a siri gaa sịrịrị werere. A na m ekele mmadụ nile nọ ebea maka nkwado unu nyere mụ na ndị ótù m.

“N’ụzọ pụrụ iche, a na m ekelekwa odeakwụkwọ ótù nhazi nhọpụta a, Dọkịnta Fidelis Nwankwo na mbọ ọ gbara ịhụ na ihe nile gara nke ọma”

N’okwu ya oge a họpụtachara ya, Sọnị-Wenike kwuru sị, “A na m ekele unu, ụmụnne m maka ntụkwasị unu nwere n’ebe m nọ. A na ekwe nkwa ịkwalite Ịdịnotu na ọdịmma Ndigbo bi na mba Sawụtụ Afrịka.

“A na ekelekwa ndị ndu Ọhanaeze Ndigbo Sawụtụ Afrịka n’ụzọ pụrụ iche, ọ kacha Onowu Ndigbo na Sawụtụ Afrịka, Ezeali Ndụbụeze Udeji, Onye Nhiwe ótù Ọhanaeze Ndigbo Sawụtụ Afrịka nakwa Dọkịnta Julius Ọsakwe, Aghaeriọsa n’Aboh, onye nke nyefere m ọchịchị n’aka”

N’okwu ọ gwara onye nta akụkọ hoo!haa!! n’oge ahụ, Ezeali Ndụbụeze Udeji, Onowu Ndigbo na Sawụtụ Afrịka nakwa onye Nhiwe Ótù Ọhanaeze Ndigbo Sawụtụ Afrịka kwuru sị, “Obi dị m ụtọ na ótù a bụ Ohanaeze Ndigbo Sawụtụ Afrịka nke m hiwere n’afọ 2002, ma debanyekwa aha ya na Ngalaba Trade & Industry nke mba Sawụtụ Afrịka, ya bụ ihe dịka ime ndebanye aha ótù na C. A. C., ma ọ bụrụ na Naịjiriya, na ọ ka kwụsịrị ike ma na-agakwa n’ihu.

“Ebumnobi m jiri hiwe ótù a bụ iji mee ka enwee ezi mmekọrịta n’etiti anyị na ndị nwe obodo nakwa ime ka enwee ihe jikọrọ Ndigbo bi n’ala ọnụ, ga enyekwa ịna adụ ndị be anyị ndụmọdụ izere ịzụ ọ́gwụ̀ ike, igwu wayo nakwa mpụ ndị ọzọ ga-emebi aha Ndigbo ebe a”.

Ezeali Udeji nyekwara Sọnị-Wenike na ndị ótù ya ndụmọdụ ka ha ghara ikwe ka ọkụ a gụnyere ha n’aka nyụnahụ ha.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close