SỌỌSỌ EBE ỌRỊA KORO NỌ N’ENUGWU BỤ N’IME “BUS” NA KEKE

Ọtụtụ ndị mmadụ n’Enugwu ekpebiela na Ọria Koro alawo.
N’ihi ya, iyi mkpuchi ihu ma ọ bụ idebe iwu ndị ọzọ maka mgbochi ọrịa ahụ anaghịkwa ewu. Sọọsọ ndị ụlọ akụ nakwa ndị ụlọ ọrụ EEDC bụ ndị ka na-esi ọnwụ na mmadụ ga-eyi mkpuchi ihu tupu ọ bata ebe ahụ.
Ótù nwoke kọrọ akụkọ ihe mere n’Enugwu, abalị ole n’ole gara aga.
Nwoke ahụ bara ụgbọala ndị njem (bus) si Otigba aga Holy Ghost. O nweghị onye ọbụla yi mkpuchi ihu n’ime ụgbọala ahụ n’abughị sọọsọ nwoke ahụ.
Kaosiladi, ozigbo e rutere OSISATECH, onye ọkwọ ụgbọala ahụ kwụsịrị, gwa mmadụ nile ka ha yinye mkpuchi ihu ha.
“Onye ọbụla yinye mkpuchi ihu ya maka ndị ara a!”. Ka a jụwara ya, ọ kọwara na ọ bụ ndị ọrụ nnyocha ụgbọala “VIO” ka ọ na-ekwu banyere.
“Sọọsọ ndị bus na ndị keke ka ha na-ajụ maka mkpuchi ihu.”
“Ọrịa Koro alawo n’Enugwu,sọọsọ na bus nakwa na keke bụ ebe ọ ka dị!”
Onye ọbụla wepụtara mkpuchi ihu, yinye. Ozigbo agafechara ndị VIO, ha wepụkwara ya.
Ọzọkwa, ndị ụgbọala na – emebi ị iwu Ọrịa Koro site na ibu mmadụ ole masịrị ha.
Ị gaa agbamakwụkwọ ma ọ bụ akwamozu, ị hụ na ndị mmadụ echefuola maka Ọrịa Koro.
Kaosiladi, ọnọdụ a abụghị sọọsọ n’Enugwu ka ọ dị etu ahụ. N’akụkụ Naịjiriya nile, ike agwụla ndị mmadụ maka Ọrịa Koro nakwa iwu ya.
Hmm, ihe anyị nọ bụ “Chi zọ ba”