SỤRỤGAWA: AKA IKENGA EKWEWO NKWA ỊKWADO IHENKIRI ASỤSỤ IGBO NKE MBỤ YA GA-ADỊ N’ENUGWU
Legọs – Agbalanze Chike Madueke, Onyeisi, Aka Ikenga ekwuola hoo!haa! na otu ahụ ga-enye Igbo Efula (Otu Asụsụ Igbo) nkwado zuru oke maka SỤRỤGAWA (Ihenkiri Asụsụ Igbo nke mbụ ya) nke ha na-ahazi.
Agbalanze, bụkwa Onyenwe Ụlọọrụ Mgbasaozi, Urban Radio, Enugwu kwuru nkea oge ndi otu nhazi Sụrụgawa bịara ya Njem Mkpọtụrụ n’ụlọọrụ dị na Victoria Island, Legọs.
O kwuru sị:
“E kelere m ndi otu Igbo Efula. Nke mbụ, ikwado ihe ọbụla gbasara omenala na asụsụ na-amasị ndi Aka Ikenga. N’ihi ya, anyị na-akwado Ihenkiri Sụrụgawa n’ụzọ pụrụ iche”.
Na mbụ n’okwu ya, Onyeisi Igbo Efula, Mazi Ikechukwu Ọjị kelere Agbalanze nakwa ndi Aka Ikenga maka mbọ nile ha na-agba maka ọdịmma Igbo
“Anyị bịara n’aha Igbo Efula maka Sụrụgawa, Ihenkiri Asụsụ Igbo, ka Aka Ikenga nye anyị nkwado”
Sụrụgawa bụ ihenkiri asụsụ Igbo nke mbụ ya (First Igbo language concert). Ihe ndi a ga-emegasị na ya bụ mmemme e ji akwalite asụsụ Igbo gụnyere; Ịgụ egwu sitere n’aka ụmụafọ Igbo dị iche iche na-ewu ewu maka agụm egwu, akpamọchị, asọmmpi ilu Igbo, ihe ngosi ekike Ndigbo(Igbo Fashion Runway), Onyinye Nkwanyeùgwù (Awards) maka ndi na-akwalite asụsụ Igbo, wdg. Ihe ndia nile ga-abụ n’asụsụ Igbo.
Igbo Efula na-ahazi Sụrụgawa site na njikọaka ha na Mịnịstrị na-ahụ maka Omenala na Njem Nkirianya na Steeti Enugwu.
Òtù ndi ọzọ na-adọnyere Igbo Efula úkwù maka Sụrụgawa gụnyere Ọgbakọ ndi Eze Ọdịnala na Steeti Enugwu nke Igwe Samuel Ikechukwu Asadụ (Ọgadagidi) bụ onyeisioche ya, Nzukọ Ụmụnna nke Ọkankuzi Chinedu Nebo bụ Onyeisi ya, wdg.
Kaosiladị, Igwe Lawrence Agụbụzụ, onye jibu ọkwa dịka Onyeisioche Ọgbakọ ndi Eze Ọdịnala na Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda (Ágbọ́), ma bụrụkwa Onyeisioche, otu mgbazi (Board of Trustees), Igbo Efula, bụ onye mbụ nyere ndi otu nhazi Sụrụgawa ndọnyeúkwù n’ụzọ pụrụ iche