AKỤKỌ ỤWAUncategorized

“SWEET MOTHER! SWEET MOTHER!! KEDU MAKA SWEET FATHER?” – NWANYỊ ORUMBA NA-AJỤ NDI HAPỤRỤ NNA HA N’IME OBODO NA-ELETA SỌỌSỌ NNE HA

Otu nwaanyị na-emebe ihe nkiri e jiri Nwanyị Orumba mara, a katọwo ajọ akparamagwa ọtụtụ ụmụaka ndi chefuziri nna ha na-elekọta sọọsọ nne ha anya.

Nwaanyị takwara ndi ụmụ nwaanyị ibe ya ụta, ndị na-ekwe ka a hapụ di ha, onye soro ha taa ahụhụ ịzụlite ụmụ ha, n’ụlọ, ọ bụrụ sọọsọ ha ka ụmụ ha na-akpọgharị ka ha ha nọnyere ha.

“Sweet Mother! Sweet Mother!! Kedu maka Sweet Father? Ụmụ nwaanyị, unu gbara ajọ. Oge ọbụla, ọ bụrụ sọọsọ unu ka a gana akpọgharị, e si Abụja a gaa Legọs, e si ya banye Lọndọn”

“Hmmmm, Nwaanyị Orumba ahinze gị oooo! Ọtụtụ oge, ndi nna na ebu ndi nwunye ha ụzọ anwụ maka na ụmụ ha na-agbakụta ha azụ.

“A kpọrọ nwaanyị na-ejegharị, ọ na-ekpori ndụ mana sọọsọ ihe a gana azụtara nna ha bụ kaikai na mmanya ọkụ.

“Ndụmọdụ m na-enye ụmụ nwoke ibe m bụ, onye na-azụ ụmụaka, ya echefukwala ileru ndụ ya n’onwe nke ya anya; ụwa bụ ofu mbịa”,

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close