TAA BỤ ỤBỌCHỊ NDIGBO (SEPTEMBA 29)


Abalị iri abụọ n’itolu nke ọnwa Septemba, afọ ọbụla bụ ụbọchị Ndigbo wepụtaworo dịka Ụbọchị Ndigbo.
Abalị iri n’itolu nke ọnwa Septemba afọ 2000 bụ ụbọchị mbụ e nwere ya bụ ụbọchị Ndigbo Mbaụwa.
N’ozi ya n’ụbọchị ahụ, Onyeisi Izugbe ótù Ọhaneze Ndigbo oge ahụ, Ọkaikpe Ezebuilo Ọzobu, laworo ezumike nka kwuru na ihe e ji họrọ ụbọchị ahụ dịka Ụbọchị Ndigbo bụ na ọ bụ n’abalị iri abụọ n’itolu nke ọnwa Septemba afọ 1966 ka a kacha sụọ Ndigbo ákwụ́ na mkpochapụ mba ndị Ugwu mere megide Ndigbo na ndị Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ndị ọzọ bi n’Ugwu Awụsa.
Ụbọchị taa bụ Ụbọchị Ndigbo ji eji ịgba na Ogene gosipụta ọṅụ n’ebe Chi Ndigbo – Okuke Abịama nọ maka mmeso ọma ya nile n’isi ha.
N’ihi ya, ọ na-abụ ụbọchị obi ụtọ bụrụkwa oge mkparịta ụka banyere ọnọdụ Ndigbo, ọkacha na Naịjiriya.
Ụbọchị taa, ka e si eme bụ ya, a tụrụ anya na ezi nwa-afọ Igbo ọbụla ga akwụrụ ọtọ ozigbo ọ kụrụ elekere iri n’abụọ nke ehihie, iji kwanyere Ndigbo nile nwụrụ n’agha Bịafra nakwa mwakpo mkpochapụ mba ndị ọzọ dị iche iche ùgwù.