TRUMP NA-ÁKWÀDÓ OKONJO-IWEALA MAKA ỌRỤ WTO

Ndị nnọchiteanya mba ndị so n’ótù European Commission(EU) nọrọ ụbọchị Mọnde na Brussels mba Beljịọm kpebie ikwado Dọkịnta Ngọzị Okonjo-Iweala nke Naịjiriya na ògbò ya nke Sawụtụ Koria, Yoo Myung-hee maka ịbụ Onye Nlekọta Ukwu nke Ótù Azụmahịa Mbaụwa, World Trade Organisation (WTO).
N’ihi nke ọgbakọ ukwu ótù ahụ nọrọ ụbọchị Tuuzdee were họrọ Okonjo-Iweala na Yoo Myung-hee maka agba ikpeazụ nke azọm ọkwa ahụ.
Kaosiladi, a tụrụ anya na Okonjo-Iweala ga-eturu ugo site na nkwado Onyeisiala Donaldị Trump nke mba Amerịka.
Nke mbụ Okonjo-Iweala bụ nwaamala mba Amerịka.
Nke ọzọ bụ na Amerịka chọrọ iji ọkwa ahụ tie ya aka n’obi maka ịhapụ ya were kwado Jim Yong Kim nke ya bụ ótù mba ahụ bụ Sawụtụ Koria oge ha abụọ zọrọ ọkwa Onyeisi Ụlọakụ Mbaụwa (World Bank) n’afọ 2012.
Yoo Myung-hee bụ onye Sawụtụ Koria ma bụrụkwa nwaamala mba Amerịka.
N’ọnwa Novemba afọ a, ka ótù WTO ga-akpọlite onye ga-anọchi anya Roberto Azevedo nke mba Brazil, onye jibu ọkwa dịka Onye Nlekọta Ukwu ótù ahụ.


