NKE NA-EME UGBUA

TỤFỊAKWA! BIANCA NA OSODIEME OBIANỌ LỤRỤ ỌGỤ, CHỌỌ ỊDỌKASỊ ONWE HA, KA A NA-EDU GỌVANỌ SOLUDO N’IYI ỌRỤ

Ọka: Ịyọm Bianca Ojukwu, nwunye dike Ndigbo laworo mmụọ, Ikemba Emeka Ojukwu na Osodieme Ebele Obiano, nwunye Dọkịnta Wili Obiano, onye ka rịturu n’ọkwa dịka Gọvanọ Anambara Steeti nọrọ taa were lụọ ezigbo ọgụ n’ihu ìgwè mmadụ.

Nke a mere n’ụtụtụ taa, oge a na-edu Ọkammụta Chalsị Chukwuma Soludo n’iyi ọrụ dịka Gọvanọ Anambara Steeti n’Obi Gọọmenti Anambara Steeti n’Ọka bụ isi obodo Steeti ahụ.

N’ezie, ụmụ nwanyị abụọ ahụ dịbu na mbụ enwe nghọtatie mana ihe butere ọgụ nke taa edochaghi anya. Ụfọdụ na – ekwu na Osodieme bu ụzọ maa Bianca ụra ebe ndị ọzọ na – ekwu na ọ bụ Bianca bu ụzọ maa Osodieme ụra.

Kaosiladị, ihe doro anya bụ na ụmụ nwanyị abụọ a nwere àgbà lụrụ ọgụ, dọọ onwe ha aka n’ákwà, sekwaa onwe ha aka na ntụtụ tupu ndị nọ nso egbosaa ha.

Ka nke a na – eme, Akpọkuedike Wili Obiano, Gọvanọ Anambara ka rịturu n’ọkwa ji ihere nọdụ n’oche na – ele n’anya tiii.

Chai! Nwoke ibe m diweooooo!

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close