AKỤKỌ ỤWA

TỤFỊAKWA! E JIDELA NWOKE OGUN STEETI NA-EDINA ADA YA DỊ AFỌ ISE

Abiokuta – Aka ndị Uwe Ojii Naịjiriya Ngalaba Ogun Steeti akparala ótù nwata nwoke, Adeyemi Babatunde, onye dị afọ iri abụọ na asatọ, onye dinara ada ya nwanyị dị afọ ise n’Ijebu Mushin oge nwunye ya wetara mkpesa n’aka ndị Uwe Ojii n’Ijebu Mushin.

SP, Abimbola Oyeyemi, Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii gwara ndị nta akụkọ nke a ụbọchị Tọọzdee.

Ọ kọwara na nne nwatakịrị ahụ chọpụtara na nwa ya na enwe oke ihe mgbu oge ọbụla ọ na-asa ya ahụ were metụ ya aka n’ihe mamịrị ya.

“Oge ọ jụsiwara ya ike, nwatakịrị ahụ gwara ya ihe nna ya na -eme ya. Nwanyị ahụ tiziri mkpu were gbaga n’ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii

“N’egbughị oge, CSO Simire Hillary, Onyeisi ndị Uwe Ojii n’ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii n’Ijebu Mushin zipuru ndị ọrụ ya ndị nwụchikọrọ ya bụ nna arụrụ ala, nkịta tara ọkpụkpụ a nyawara ya n’olu.

Tụfịakwa! Chineke ekwela ngwere gbaa ajị!

Tụfịakwa! Chineke ekwela ngwere gbaa ajị!

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close