AKỤKỌ ỤWA

TỤFỊAKWA! NWATAKỊRỊ GBURU MA DINAA NNE YA MAKA ỌGWỤ EGO

Bini: Aka ndị Uwe Ojii akparala Samuel Akpobome,onye dị afọ iri n’asatọ, onye gburu ma dinakwaa ozu nne ya iji gwọọ ọgwụ ego.

Oge Kọmishọna ndị Uwe Ojii n’Edo Steeti, Mazi Jọnsịn Kokumo kpụpụtara ya na ndị omekome mmadụ iri asatọ ndị ọzọ n’ihu ndị nta akụkọ n’isi ụlọ ọrụ Ndị Uwe Ojii, Ngalaba Edo Steeti na Bini ụbọchị Mọnde.

Akpobome kwupụtara na ya tọgburu nne ya, Kristiana Ighoyivwi, ka ọ nọ n’ụra na be ha dị n’okporo ụzọ Ahịa n’Ologbo dị n’Okpuru Ọchịchị Ikpoba-Okha nke Steeti ahụ.

Nwatakịrị ahụ bụ nwa ikpeazụ nne ya mụrụ kwuru na ya dinakwara ozu nne ya site na ntụziaka ótù nwa dibịa nọ n’Oghara, Delta Steeti iji nwee ego.

“O nweghị etu nne m siri mejọọ m kama e gburu ya ma dinakwaa ozu ya iji baa ọgaranya”

Hmm, nkea bụ arụ kwọ nwa n’azụ! Nwatakịrị ka dị afọ iri n’asatọ, ọ guchaala akwụkwọ ma ya fọdụzịa ịkpata ego mere igbu ozu ji agụ ya?

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close