TUFỊAKWA! NWATAKỊRỊ OGUN STEETI EGBUOLA NNA YA, BERE ÚTÙ YA MAKA ỌGWỤ EGO



Abiokuta – Nwokorọbịa dị afọ iri abụo, Ridwan, egbuola nna ya, bere ya amụ iji mee ọ́gwụ̀ ego n’Oshoku dị n’Okpuru Ọchịchị Mgbago Ugwu Ijebu nke Ogun Steeti.
Soji Ganzallo, onyeisi otu nchekwa So-Safe kwuru na ndị ọrụ ya nọ ọrụ n’Oshoku nụrụ mkpu ákwá n’ebe ekelere iri na abụọ nke ime abalị were gbaga ịga mara ihe na-eme.
“Ndi nche anyị hụzịrị ozu nwoke ahụ bụ Ishau ka ọ tọgbọrọ n’ime ụlọ ebe ahụ, nwa ya nwoke ahụ gbalagakwara. A chụwara ya ma nwuchikọọ ya n’ime ọhịa”

Ganzallo kọwara na ya bụ ajọ ‘Nwa si owere baa nne ya afọ’ kwụpụtara na ọ bụ ya gburu nna ya maka iji mee ọ́gwụ̀ ego.
O kwuru na ya ji ụdọ tọgbuo ya wee bere ya útù, akpịrị ma fopu ya eze anọ dịka nwa dibia ahụ bụ Baba Kekere siri nye ya ntụziaka maka imere ya ọ́gwụ̀ ego
Ganzallo kwuru na nwokorọbịa ahụ jụrụ ikwu ebe ya bu dibia ahụ nọ.
Chai! Ụwa mmebi! Nwata nwokorọbịa dị afọ iri abụo, gịnị ka o ji ego eme mere ọ ga-eji gbuo nna mụrụ ya , iji bute ike?