NKE NA-EME UGBUA
TỤFỊAKWA! NWOKE EJIRIWO MAKA Ọ́GWỤ̀ EGO BEE NWA YA NWOKE N’ERUBEGHI AFỌ ABỤỌ ISI



Asaba: Aka ndị Uwe Ojii akparala Gabriel Volts, nwata nwoke dị iri afọ atọ na atọ, onye jiri “hand saw” were kwọjipu isi obere nwa ya nwoke dị sọọsọ ótù afọ na ọnwa asatọ maka ọ́gwụ̀ ego.
Ozi DSP Bright Edafe, ọnụ na-ekwuru ndị Uwe Ojii na Delta Steeti zipụrụ na Twitter na – akọwa na “Nna arụrụala” ahụ gburu nwa ya ma lie ya n’ukwu nkwụ dị n’ọhịa Etinabobo n’Edo Steeti.
Nwunye tikuru ndị Uwe Ojii oge di ya sịrị ya asị, na nwa ya ahụ, no na nke nwanne ya nwaanyị na Wọrị, Delta Steeti.
Edafe kwuru na ya bụ nwaamadị ekwuputawo na ebubo e boro ya bụ eziokwu.
Tụfịakwa! Ụwa emebiwo!