TỤFỊAKWA! ỤMỤ OKOROBỊA KADUNA ABỤỌ ENYIWO NWANNE HA NWOKE NA NDỤ MAKA EKWENTỊ



Kaduna – Akụkọ ọjọọ si Zarịya nọ na Steeti Kaduna apụta na-ekwu na ụmụ okorobịa abụọ enyiwo nwanne ha nwoke dị afọ iri na isii na ndụ maka ekwentị na efu efu.
Ụmụnne abụọ ahụ ndi dị afọ iri abụọ na afọ iri na asatọ ka ndi Uweojii nwuchikọrọ oge ótù onye obi ebere hụrụ ka isi nwatakịrị nwoke ahụ sepụtara n’ime ónùnù dị n’ụlọ ebe mmadụ ebighi, zọpụtara ya ma kpọzịa ndi Uweojii.
Site n’ozi hoo!haa!!, ụmụnne atọ ahụ nwere nghọtahie maka ekwentị na efu efu n’Abụja bụ ebe ha bi na-arụ ọrụ.
Kaosiladị, ha chụrụ ya si Abụja lọta Zarịya, were kechie ya ọnụ, kechie ya aka, lie ya n’ime ónùnù, sọọsọ isi ya pụtara n’elu.
N’okwu ya, Hajiya Rabi Salisu, Kọmishọọna na-ahụ maka Mmekọrịta Mmadụ na ibe ya na Steeti Kaduna kwuru sị,
“A hụbeghi m udiri ihe a na ndụ m. Sọọsọ ebe m na-ahụ ka e liri mmadụ na ndụ bụ n’ejije. Ụmụnne nwatakịrị nwoke a bụ Abụbaka liri ya na ndụ maka ekwentị na-efu efu”
O kwuru na a ga -akpụga ụmụ okorobịa abụọ ahụ ụlọikpe ma emechaa nnyocha.