ỤBỌCHỊ NCHETA ỌMỤMỤ UJU NWANEKEZIE-EGEMOLE (UJU JULU EJU)



Aha m bụ UJU Nwanekezie-Egemole. A bụ m onye Ọkịja nke dị n’okpuru ọchịchị Ihiala, Anambara steeti mana anụkwa di n’Amandụgba nke dị n’okpuru ọchịchị Isu n’Imo Steeti.
A na m azụ ahia akwa ụmụ nwanyi (Indian Bubu gowns/tops), mficha eze (KokLiang Chinese herbal toothpaste) maka eze isi, eze ọma ijiji , eze ụtaba machare ebu na eze na-ere ure) ya na ncha KokLiang Chinese herbal soap ( maka ahụ isi, ụmụ nje(germs) na oria akpụkpọ ahụ( skin diseases) di iche iche) Anyi nọ ‘Ọnịcha Anambra steeti ma ọ bụ kpọọ anyi n’akara ekwenti- efu asatọ efu atọ asaa asatọ anọ isii abụọ asaa otu. Bia zụrụ otu ma ọ bụ karia( wholesale and retail).
Mgbe a mụrụ m na Nnukwu n’ụlọ ọgwụ ndị uka katọliki, Boromi nke dị n’Ọnịcha, ezigbo Nna m gbapụrụ ụda egbe ole na ole iji gosi na Nnukwu mmadụ bịara n’ụwa. Nna m kwuru na m bụ kpakpando na-amụke amụke (shining star); na m ga-achake ebe ọbụna mụ nọ. Ka mkpụrụobi Nna m, Ezenwammadụ gaa n’ihu izu Ike na ndokwa. Isee.
Taa bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ m.
Ekele dịlị Ọbata Obie, onye ekwebeghị ka ajụ m ruo ala. Ihe Chukwu na-eme n’ndụ m na-agba anya mmili. Ogige Ọ na-agba m na-awụ m akpata oyi n’ahụ. Jehova ejirila ngọzị bara ụba nke m etorughịị chọọ m mma. A bụ m onye a gozili agọzi, onye Chineke hụrụ n’anya nke ukwuu.
Ụmụnne m, biko soronụ m nụrịa ma kelee Obinigwe.
U-J