AKỤKỌ ỤWA

ỤGBỌ OLOKO AKWỌRIELA ÓTÚ NWOKE KA, Ọ NA-ACHỌ ỊZỌPỤTA NWA YA

Legọs : Ụgbọ oloko nọrọ ụbọchị Mọnde n’Oshodi, Legọs were kwọrie ótú nwoke onye Anambara Steeti, Kristova Ngọbidi, onye na-atụbata akpụkpọ ụkwụ a ma ama, oge ọ na-achọ ịzọpụta nwa ya nwoke nọ n’ime ụgbọala ya arahụ ụra.

Nwoke ahụ dọsara ụgbọala ya n’elu ókpórò oloko ahụ na-eche ka e meghee ọnụ ụzọ ámá ụlọ ahịa ha.

Kaosiladi, oge ọ hụrụ ka ụgbọ oloko ahụ na-abịa, ọ gbatara ka ọ zọpụta nwa ya nọ n’ime ụgbọala ya arahụ ụra ụgbọ oloko ahụ were kwọrie ya.

Tupu ọ ga – esi n’ụgbọala ahụ pụta, ụgbọ oloko ahụ kụriri ha kụrụ ha tinye n’ọnwa mmiri.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close