AKỤKỌ ỤWA
ỤGBỌALA D.I.G. NDỊ UWE OJII AKỤGBUOLA ONYE ỌKADA N’AKURE


Akure: Ụgbọala Toyota SUV ótù onye isi ndị Uwe Ojii nọ n’ọkwa Deputy Inspector-General (DIG) nke ndị Uwe Ojii Naịjiriya akụgbuola akụgbuola onye ọkada n’okporo ụzọ awara awara Akure-Ondo ụbọchị ụka.
Ụgbọala ahụ, site n’ozi hoo!haa!! nwetara, gbalahụrụ onye nya ya n’ọsọ were gaa kụgbuo onye ọkada na-agara onwe ya.
Mazị Tee-Leo Ikoro, Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii na Steeti ahụ kwuru sị,
“Ọ bụ ụgbọala so n’usoro nke DIG bụ ihe nwere ihe mberede okporo ụzọ ahụ, amaghị m ma o nwere onye nwụrụ na ya”
.