NKE NA-EME UGBUA

ỤGBỌALA IBU “BRAKE” YA PỤRỤ KARA IGBU ỌTỤTỤ MMADỤ N’ENUGWU TAA

Enugwu: N’ehihie taa n’Okporo ụzọ Ọkpara Avenue, Enugwu, ótù ụgbọala ibu (truck) “brake” ya pụrụ apụ kara ikuri ọtụtụ ụgbọala ma kworikwaa ndị na-aga n’ụzọ ma ọ bụghị site n’amara Chineke.

N’agbanyeghị na ebe ahụ nọ na mkpọda ugwu, onye ọ̀kwọ́ ụgbọala jisiri ike, were nwayọ chenye ụgbọala ahụ ihu na nkebi ụzọ (median strip) ebe ọkụ okporo ụzọ (Street light) dịcha.

Ụgbọala ibu ahụ rịgooro na nkebi ụzọ ahụ were kụtuo ótù ọkụ okporo ụzọ tupu ọ kwụsị.

Maka na ọdachi ahụ dapụtara n’ebe elekere abụọ, oge ụmụ akwụkwọ ji agbasa akwụkwọ, ụzọ nile na-ekwo ekwo.

Hmm, Chukwu rukwara ọrụ.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close