ỤGBỌALA TANKER BU MMANỤ ATANWURUWO ỌKỤ, TAA ISI MMADỤ ABỤỌ



Abiokuta: Mmadụ abụọ nwụnyụrụ anya n’ụtụtụ taa bụ Tuzdee, oge ụgbọala tanker bu mmanụ ọkụ diesel nwere ihe mberede were tanwuru ọkụ n’elu ógwè Kara dị n’ụzọ awara awara Legọs – Ibadan, n’Ogun Steeti.
Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na ya bụ ụgbọala nke akara ndebanye aha ya bụ DTM 109 XA, gbanahụrụ onye ọ̀kwọ́ ụgbọala bu ya, were suo n’ókpòrò mgbochi (railings), ya bụ ógwè nke mere na isi ya kpopuru danye n’ólùlù dị na mkpọda ebe ahụ, ebe ahụ ya gbariri ma tanwuru ọkụ.

Mmadụ abụọ nọ n’ihu ụgbọala ahụ tufuru ndụ ha n’ihe mberede ahụ.
Ka mmanụ ọkụ ghasasịrị ebe niile ndị ọrụ ntinyụ ọkụ gbara mbọ ka dike ịhụ na ebelatara mkpa mkpa sitere n’ọkụ ọgbụgba ahụ.
Onye Kọmandantị ụlọ ọrụ nchekwa njem okporo ụzọ bụ Federal Road Safety Corps, FRSC, n’Ogun Steeti, Ahmed Umar, kwuru na ihe kpatara mberede okporo ụzọ ahụ bụ na onye ọ̀kwọ́ ụgbọala ahụ ji oke ọsọ nke mere na ụgbọala ahụ gbanahụrụ ya.