
Enugwu: Òtù ndị ntorobịa Ogwuiyi Nike ajụla Kọmitii mkpezi mmadụ isii nke Gọvanọ Ifeanyị Ugwuanyị hiwere maka mkpezi okwu ala dịrị ha na ndị Ugwuajị Ọkụnanọ.
N’akwụkwọ ozi nke ndị òtù a degaara Ugwuanyi, ha kọwara na nkea a bụ maka na okwu ala ahụ nọ n’ụlọikpe.
Ndi òtù ahụ kpọkuziri Gọvanọ Ugwuanyi ka o jiri ikike ya kwụsị ndị nile na-awaba n’ala ha dịka Mịnịstrị na – ahụ maka Ịrụ Ụlọ, ndị Ọkụnanọ nakwa ndị ọzọ.
N’akwụkwọ ozi ahụ nke Onyeisi oche ha bụ Fidelis Ọnụchukwu tinyere aka, nke isiokwu ya bụ: “ALA AGỤOWO, OGWUIYI NIKE: NKE BỤ EZIOKWU NAKWA ỊKPỌ ÒKÙ MAKA IKPE NKWỤMỌTỌ”, ha kpọrọ òkù ka Gọọmenti Enugwu Steeti tinye n’ọrụ mkpebi ókèala dị n’etiti ndị Ogwuiyi na ndị Ọkụnanọ nke ndị Ọcha kpere n’afọ 1942, bụkwa nke Onye bụbu Osote Gọvanọ Enugwu Steeti ma bụrụkwa Onyeisi oche Kọmitii okwu ala, Okechukwu Ịtanyị nabatakwara.
are not taken.
“N’afọ 2002, ga o weghaara ala maka ịrụ mpaghara Independence Layout Phase 11, Gọọmenti Enugwu Steeti hiwere Kọmitii nke Osote Gọvanọ Okechukwu Ịtanyị nọ n’isi ya nke kpebiri na ókèala ndị Okpuru Ọchịchị Mgbago Ugwu Enugwu na Okpuru Ọchịchị Ndịda Enugwu bụkwa ya bụ ókèala ndị Ogwuiyi na ndị Ugwuajị. “
Ọnụchukwu rịọzịrị Gọvanọ Ugwuanyi ka o tinye ọnụ n’okwu ahụ ozigbo tupu o rie isi mmadụ maka na “e mee ngwangwa e megharịa ọdachi”