ỤKỌ MMIRI: NWA-AFỌ NENWE BI SAWỤTỤ AFRỊKA AGBATARALA NDỊ BE HA ỌSỌ ENYEMAKA
Enugwu: Ụbọchị Satọdee, ndi ọnụmara Ụmụlevo nke dị n’Emudo-Nenwe nọ n’Okpuru Ọchịchị Anịnri, Enugwu Steeti jupụtara n’ọṅụ maka ọsọ enyemaka ótù nwa ha nwoke gbatara ha maka nsogbu ụkọ mmiri.
Ya bụ nwaamadị ahụ bụ Iveanyị Ùkwúìnyì, onye bụ òjì ego achụ ego bi na mba Sawụtụ Afrịka bụ onye nwere mmụọ imere ọha ihe.
N’agbanyeghị na ọ nọghị ya, o zitere ego e ji kpọọ ndị ụgbọala ochu mmiri (tanker) ndị bịara ugboro ugboro were gbanyere ndị obodo ahụ mmiri.
O mmekwara ka ógbè abụọ nọ n’Ụmụlevo; Ámáẹgụ na Ọbụlọ keta oke na ya bụ ịgbanye mmiri n’efu.
N’ehihie ụbọchị ahụ, ndị mmadụ bupụtara ngwo ngwo ha ji agbata mmiri, kwụnye n’ahịrị were na-eche ụgbọala tanker mmiri ahụ. Ndi Ámáẹgụ pụtara n’Obodo Ụmụigbo ebe ndị Obụlọ pụtara n’Obodo Obụlọ.
Ndi obodo ahụ kọwara na kemgbe ọkọchị afọ a, na nwaamadị a na abụ a gụrụ gụrụ, o zitere ha ndị ụgbọala tanker mmiri, ịbịa gbanyere ha mmiri.
N’okwu ya, Mazị Ọgọstịn Nwobodo, onye soro hụ na ya bụ ihe gara n’usoro kwuru sị, “Ndị be anyị na-ekele nwaamadị a bụ Iveanyị Ùkwúìnyì etu o siri gbatara anyị bụ ndị bi n’ụlọ ọsọ enyemaka maka nsogbu ụkọ mmiri.
“Mmiri ala ebe anyị na-aga echu mmiri tere nnukwu aka. Ala anyị adịghịkwa mma igwu ụmị (well) maka na mmiri na-agbapụta na ya bụ mmiri agbọ ncha (hard water).
“Anyị na-arịọ Gọọmenti ka ha gbatara anyị ọsọ enyemaka maka nsogbu mmiri a”
Chineke gozie nwa amadi a ma mee ka akapa ya ghara ita ata.