AKỤKỌ ỤWA

ỤKỌCHUKWU EBOOLA ỌTAKAGỤ NANKA EBUBO ILI Ọ́GWỤ̀ N’ỤLỌ ỤKA WERE DINYE NDỊ TIRI YA GWOO GWOO

Ụbọchị Sọnde gara aga, ọdachi dakwasịrị Mazị Chukwudị Chinedu, onye a makwara dịka Ọtakagụ Nanka ka ọ gara ọrụ ịma mbem na mmemme e nwere n’akụkụ Àfọ̀ Ígwè Ogidi, Anambara Steeti.

Ọtakagụ, onye na-arụkwa dịka onye nta akụkọ mgbakwunye n’ụlọ mgbasa ozi Solid FM, Enugwu na Odenigbo FM, Obosi, Anambara Steeti, dọsara ụgbọala ya n’ogige ụlọ ụka Angịlịkan Onye Nsọ Ịmanụwel, Àfọ̀ Ígwè Ogidi nke didebere ebe a kpọrọ ya ọrụ.

Ụkọchukwu Ọranyelụ Nwanweke, onye nlekọta ụlọ ụka ahụ hụzịrị ka o ji ụkwụ aga ebe a na-eme mmemme were kpọghachi ya azụ.

Maka na Ọtakagụ kere ekike omenala ma jidekwa ójí n’aka, Ụkọchukwu ahụ boro ya ebubo na ọ bụ dibịa bịara ili ọ́gwụ̀ n’ogige ụlọ ụka ahụ.

N’agbanyeghị nkọwa nile Ọtakagụ nyere, Ụkọchukwu Nwanweke dịnyere ụmụ okorobịa nọ ebe ahụ ka ha tiwe ya ihe ruo na o kwuo onye dinyere ya.

Ha kụrụ ya gwoo gwoo, kugide ya ọ na-achọ ikubi tupu ha ahapụ ya. Ha dọkasịrị ihe nile o ji ma ha ahụghị ọtụmọkpọ ọbụla.

Hmm, Ndigbo “Ụzụ amaghị akpụ ogele lee egbe anya n’ọdụ” maka na mmadụ ịdị ka ọnụ a kọrọ ya ajọka.

N’ala Yoroba, ndị ụka, ndị Alakụba na ndị omenala na – ebi n’udo n’ime òtù ezinụlọ. Gịnị mere nke Ndigbo jiri pụọ iche?


Show More

Related Articles

One Comment

  1. Otakagau jee n’ulo ndi uwe ojii jee kpesalu fa ife melu nu. O mesia nkea, ochoo okiwu (lawyer) ga-agba ukochukwu a akwukwo n’ulo ikpe

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close