AKỤKỌ ỤWA

ỤKỌCHUKWU GBURU ONYE DIBỊA, SỊ NA MỤỌ NSỌ DINYERE YA

Ọnịcha: Uchenna Chukwuma, ụkọchukwu dị afọ iri abụọ n’otu egbuola Mazị Chukwudị Ugwu, dibịa dị afo iri isii na Nkpọọ, Anambara Steeti.

Ọnụ na-ekwuru ndị Uwe ojii na Steeti ahụ, Haruna Mohammed kọwara na ya bụ nwoke kpọrọ onwe ya ụkọchukwu kwuru na ọ bụ Mụọ Nsọ dinyere ya ka o gbuo onye dibịa ahụ, onye ọ sịrị na – a bịakwute ya na mmụọ were na-emebiri ya ihe.

Ụkọchukwu ahụ kwuru na nke ahụ mere na ya enweghị ego.

Mohammed kwukwara na ndị Uwe Ojii si ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii nọ n’Ogidi gbatara ọsọ enyemaka were hụ ozu ya bụ dibịa nke bụ onye Ụmụavụlụ Abọ, dị n’Okpuru Ọchịchị Udi n’Enugwu Steeti ka ọ tọgbọrọ n’ime ọbara si ya n’ahụ sọpụta.

O kwuru na ha nwetakwara mma ogbuadana e jiri gbuo ya bụ ọchụ.

Hmm, arụ na-emekwa! O nweghị ihe ndị mmadụ agaghị ebogide Mụọ Nsọ.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close