AKỤKỌ ỤWA

ỤLỌ AKWỤKWỌ EKULU, ENUGWU GA-ADỊKWA KA Ọ DỊBU NA MBỤ – JIDEỌNWỌ

Enugwu: Mazị Odeiga Jideọnwọ, onye nwe ụlọ nkwari akụ Oakland Hotel, Enugwu ekwuola na ụlọ akwụkwọ Praịmarị Ekulu nọ na mpaghara G.R.A.,Enugwu ga-adịkwa ka ọ dịbu na mbụ, n’oge n’adịghị anya.

Jideọnwọ kwuru nke a oge o duuru ụfọdụ ndị gụrụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ bịa njem mkpọtụrụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ ụnyaahụ.

“Ọ bụ mmasị anyị bụ ndị gụrụ n’Ekulu ịhụ na ụlọ akwụkwọ a weghara ọnọdụ ya dịka ụlọ akwụkwọ Praịmarị kacha mma n’Enugwu Steeti.

Jideọnwọ, onye nke hapụrụ ụlọ akwụkwọ ahụ n’afọ 1986 bụrụkwa onye nne ya laworo mmụọ kuziri ebe ahụ, kwara arịrị maka ajọ ọnọdụ ụlọ akwụkwọ.

“N’oge nke anyị, Ekulu bụ ebe ụmụ Gọvanọ, ụmụ ndị ọcha nakwa ndị ọzọ nwere àgbà na-agụ. Ugbua, Ekulu bụzị ụlọ akwụkwọ ndị odibo nakwa ihe m ji eyi ụmụ egwu. Oge ọbụla ha emeghị ọfụma, n gwa ha na m ga-etinye ha n’Ekulu, iji yijaa ha”.

Ndị ọzọ so ya bịa njem ahụ gụnyere Dọkịnta Ada Ọzọkwọ Madụka, Mazi Ikechukwu Bismarck Oji, MNSE, OmenkaChidi Okeke, Oriakụ Chịkọdịlị Okereke na Oriakụ Obinne Obiefuna.

Na nzaghachi Oriakụ Yunisi Chime, Onyeisi ndị Nkuzi n’ụlọ akwụkwọ Praịmarị Ekulu nke anọ, onye kwuru okwu n’aha ndị ótù ya kelere ndị ahụ gụrụ n’ụlọ akwụkwọ maka icheta ebe ha gụrụ.

“Na mbụ anyị na ekele unu nile ndị chetara Ekulu, ebe unu gụrụ akwụkwọ Praịmarị, ọtụtụ afọ gara aga.

“Anyị na-ekelekwa Aka na-achị Enugwu Steeti, Rt. Hon. Ifeanyịchukwu Ugwuanyi nakwa ndị Ụlọ ọrụ ENSUBEB maka ndozi ha doziri ụlọ akwụkwọ a.

Ọrịaku Chime kọwara ụfọdụ nsogbu ha dịka enweghị ọnụ Ọgụgụ ndị nkuzi kwesịrị ekwesị, enweghị ụlọ ọrụ ndị nkuzi e mezi nke ọma, enweghị mmiri pọmpụ, wdg.

Ndị ótù ya soro nabata ndị ahụ gụrụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ gụnyere Oriakụ Bena Ene, Onyeisi ndị Nkuzi n’ụlọ akwụkwọ Praịmarị Ekulu nke atọ, Oriakụ Matịna Ogbonna, Onyeisi ndị Nkuzi n’ụlọ akwụkwọ Praịmarị Ekulu nke mbụ nakwa Oriakụ Sịbịịlụ Ezenwugo, Onyeisi ndị Nkuzi n’ụlọ akwụkwọ Praịmarị Ekulu nke abụọ.

Ndịisi ndị nkuzi ahụ mechara duru ndị ọbịa ahụ gagharịa n’ogige ụlọ akwụkwọ ahụ iji mee ka ha were anya ha hụ etu ihe siri dị.

Show More

Related Articles

One Comment

  1. Ihe edemede a masiri m nke ukwu nihi na Ekulu praimari bu ebe mu na umu nne m ano gara akwukwo. Ya gazie omenka Bismark Oji

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close