ỤLỌ ỌRỤ ÒSÍSÍ MMANỤ ÁGBÍDÍ DANGOTE: NNPC, RỤZIENU NDI NKE GỌỌMENTI NWE, KA ASỊRỊ LAA -AGBAKỌBA



Ochiedike Ọkaiwu Olisa Agbakoba,enyewo ụlọ ọrụ Nigerian National Petroleum Corporation (NNPC) adọmaka na ntị megide iweghara ụlọ òsísí mmanụ ágbídí Dangote.
Agbakọba nyere adọmaka na ntị ahụ maka okwu Akajiakụ Aliko Dangote gwara ndi NNPC ka ha bịa weghara ụlọ òsísí mmanụ ágbídí ya, ma ọ bụrụ ya ga-eme ka ha kwụsị ịkpọ ya onye chọrọ iweghara ihe nile sọọsọ ya.
Ihe butere okwu ahụ Dangote jiri iwe kwuo bụ ebubo ụlọ ọrụ NNPC boro ya na ụlọ ọrụ na-emepụta mmanụ adịgboroja.
Onyeisi ụlọ ọrụ Nigerian Midstream and Downstream Petroleum Regulatory Authority, Farouk Ahmed, kwuru na Dangote na ụlọ ọrụ òsísí mmanụ ágbídí ndị ọzọ dị n’ala anyị na-emepụta mmanụ adịgboroja.
Ahmed kwuru sị, “Anyị agaghị echekwube ótú ụlọ ọrụ òsísí mmanụ ágbídí maka ala anyị, Dangote chọrọ ka a akwụsị ịtụbata mmanụ ụgbọala n’ala bekee, si n’aka ya zụrụwa ihe nile. Kaosiladị, nke ahụ adịghị mma maka ala anyị maka adịghị ama ama. Ọ dịghị mma maka ọ ga-abụzị sọọsọ ya ịkpakọrọ ihe nile”
Nkea wutere Dangote, onye sịrị NNPC bịa weghara ụlọ ọrụ òsísí mmanụ ágbídí ya.
“Ha (NNPC) bịa zụrụ ya, ma lekọta ya etu masịrị ha. Ha akpọwo m onye chọrọ ịkpakọrọ ihe nile sọọsọ ya. Nke ahụ adịghị mma, o zighikwa ezi. Ha bịa zụrụ oke m n’ụlọ ọrụ ahụ ka onye chọrọ ịkpakọrọ ihe nile sọọsọ ya chaara ha n’ụzọ”
Kaosiladị, Agbakọba ekwetaghi n’okwu ahụ, “Mbanụ! Gịnị mere Gọọmenti ga-eji weghara ihe mmadụ nkịtị rụrụ? Gịnị mere na ha enweghị ike idozi nke Gọọmenti ka ọ rụwa ọrụ?
“Ụzọ kacha mfe iji kwụsị akụkọ maka ótù onye ịkpakọrọ ihe nile sọọsọ ya bụ ime ka ihe nile rụwa ọrụ na Naịjiriya.
“Ka ọkụ dị, ka ezigbo okporo ụzọ dị tinyekwara ezigbo ahụike na nchekwa. Ka ụlọ ọrụ òsísí mmanụ ágbídí Gọọmenti rụwa ọrụ. Oge ahụ, akụkọ maka ótù onye ịchọ ịkpakọrọ ihe nile alaa kpamkpam.