ỤLỌELU ŃKWÀGÓ ABỤỌ ADAGBUWO NWOKE KAPỊNTA N’ENUGWU



Enugu – Nwoke kapịnta anwụnyụọla anya oge ụlọelu nkwago abụọ a ka na-arụ arụ dara n’Abakpa Nike, Enugwu, taa bụ Tuuzdee.
Nwaamadị ahụ tufụrụ ndụ ya n’ọdachi ahụ so na ndi kapịnta nọ ọrụ n’ụlọ ahụ dị n’okporoụzọ Ugwunwani, nọdebere ebe Nkwụsị Ụgbọala Cornerstone nke akụkụ ya ụfọdụ zèrè ka ha nọ n’ọrụ.
Onye akaebe nọ oge ahụ kwuru na ihe zèrè bụ ǹzọ̀ (step) a na-arụnye n’ụlọ ahụ.
“Ya bụ kapịnta, onye si Steeti Krọs Riva na -ehopụta osisi e jiri rụọ ọrụ mgbe ǹzọ̀ jiri daa.
“Anyị nụrụ mkpu akwa ya, gbata bịa dọpụta ya n’okpuru akụkụ ụlọ ahụ dakwasịrị ya. Mana ọ naghị emegharị ahụ.
Ụmụnne kiziri iwe wakpo onyenwe ụlọ ahụ, onye nọ oge ya bụ ihe mere were kụọ ya gwoo gwoo.
Chai! Ka mkpụrụ obi nwaamadị ahụ zuru ike na ndokwa! Iseeeeeee!