AKỤKỌ ỤWA

ỤLỌIKPE ATỌHAPỤWO NWOKE E BORO EBUBO IDINA NWANYỊ N’IKE, NA MMEKỌAHỤ AHỤ BỤ SITE NA NKWENYE ENYI YA NWANYỊ

Ado Ekiti: Ụlọikpe ukwu Ekiti Steeti anọrọwo n’Ado-Ekiti were tọhapụ ótù nwaamadị dị afọ iri atọ na atọ, Adekunle Samson, onye e boro ebubo idina nwanyị n’ike ka ọ nọchara afọ atọ na nga.

A kpụrụ ya ụlọikpe n’abalị itoolu nke ọnwa Novemba, afọ 2019.

Ebubo e boro ya kwụrụ sị, “Adekunle Samson nọrọ n’abalị iri abụọ na ise nke Eprel, afọ 2018, na Ise Ekiti, were dinaa ótù onye bụ Yemi n’ike, were si na ya daa iwu Ekiti Steeti nke afọ 2012, isi 358, usoro nke Ch16, nke Iwu banyere arụrụala”

Onye Uwe Ojii ji okwu ahụ, Richaadị Olowoyo kpọrọ ndị akaebe atọ ma wetakwa ihe akaebe dịka akwụkwọ nnyocha ahụike na mmà obeji.

Kaosiladi, Adekunle, onye sịrị n’aka ọka iwu ya kwuo okwu, akpọghi onye akaebe ọbụla

Na ịka ikpe ya, Ọkaikpe Bamidele Omotoso kwuru sị, “E kpebiri m na onye gbara akwụkwọ egosipụtanwughi n’ụzọ doro anya etu onye a gbara akwụkwọ siri dinaa nwanyị n’ike.

“Ihe m chọpụtara bụ na tupu oge ahụ, onye a gbara akwụkwọ na onye o megidere na – ayị ọyị na enwekwa mmekọahụ, tinyere na ya bụ mmekọahụ mere ndị Uwe Ojii jiri kpụrụ nwaamadị a bụ site na nkwenye “onye ọ megidere”. Na mmechi, Adekunle Samson abụrụwo onye atọhapụrụ maka na ikpe amaghị ya n’ebubo idina nwanyị n’ike”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close