ỤLỌIKPE KANO AMAWO ONYE CHINKO IKPE ỌNWỤ MAKA ỊSỤGBU ENYI YA NWANYỊ
Kano – Ọkaikpe Sanusi Ado Ma’aji nke Ụlọikpe Steeti Kano dị na Bompai, Kano anọrọla ụbọchị Tuuzdee maa Mazị Quandong Geng, onye Chinko ikpe ọnwụ maka imemila enyi ya nwaanyị Ummulkusum Sani Buhari (Ummita).
Geng nọrọ n’ọnwa Septemba, afọ 2022 wakpo Ummita n’ụlọ ya, ebe o ji mma sụgbuo ya, ka ha nwere nghọtahie.
Ya bụ nwoke Chinko riri mbọ mbọ ọsọ mana aka ndi Uweojii kpaara ya.
Ka ndi Uweojii na-agba ya ajụjụ ọnụ iji kwuo onye chiri ya bụ ezekudene ọ́zọ́, Geng kwuru na nwa agbọghọ ahụ mewara ya obi site na iricha ego ya, hapụ ya gaa lụọ onye ọzọ.
“Akwa agbamakwụkwọ na ihe ndi ozo m zụtara ya maka agbamakwụkwọ anyị karịrị N1.5N tinyere asọebi ndi enyi ya ga-eyi. E nyekwara m ya ego ọhụrụ dị N700, 000 aga abọ ụbọchị ahụ. Oge m gara hụ ndi be ha na Sokoto, e mefukwara m N700,000.
“N’abalị iri na atọ ọnwa Septemba afọ 2022, ọ nara m ego iji zụta ihe o ji arụ ụlọ n’Abụja mana e nyenwughi m ya maka na e jighi m ego oge ahụ. Kemgbe ahụ, ọ kwụsịrị ịza m oku n’ekwentị maka na o chere na m etiela, na m e jighizi ego.
“A zụrụ m ya ụlọ N4N ya na ụgbọala N10N. E nyekwara m ya N18N, ka o jiri bido ahịa. A na ma akpọ ya aga n’ebe dịka Bristol Palace nakwa Central Hotel ịga rie nri. E nyekwara m ya N6N, iji gaa ije maka asambodo ya na Mahadum Sokoto.
Nwaamadị ahụ kwuru na ya mefuru ego ahụ nile maka na ya chọrọ ịlụ ya bụ nwa agbọghọ mana ọ hapụrụ ya gaa lụọ onye ọzọ.
Kaosiladị, ụlọikpe ahụ mara ya ikpe ọnwụ maka igbu ọ́chụ̀.
Chai! “Onye Chinko, nwoke ibe m diweooo! N’ezie, nwa agbọghọ a riri gị mugu ka ọ na ị bụghị mmadụ. Yaa, o meghiri gị ebere ọbụla chaa chaa.
Kaosiladị, ị gara idi ya maka na ihe nwoke mere enyi ya nwaanyị bụ “alawa aghara”, n’agbanyeghị ego ole ọ bụ. Ụwa gị ọzọ, mụrụ anya ka azụ.