Uncategorized

ỤLỌIKPE LỌNDỌN ATỤWO NWOKE NAỊJIRIYA PỊARA NWA YA ỤTARỊ NGA AFỌ ATỌ

Ụlọikpe ikpe mkpegharị nke mba Ịnglandị na Wélsi, Lọndọn atụwo nwata nwoke Naịjiriya nga afọ atọ maka ịpịa nwa ya nwoke dị afọ itoolu ụtarị .

Ụlọikpe nọ na mpaghara Woolwich, Lọndọn tụburu ya bụ nwoke dị afọ iri isii na isii nga ọnwa iri abụọ na abụọ. Kaosiladi, Gọọmenti mba ahụ kwuru na oge nga ya mere mpe iji tụnyere arụ ọ kpara meziri ha ji wega okwu ahụ n’ụlọikpe mkpegharị.

Nkea bụ maka ihi na ka o ji mkpara ígwè nakwa ájị̀ úkwù(belt) were pịachaa nwatakịrị ahụ ihe, ọ gwakwara ya ka ọ chilie aka elu chebe ihu ótù ebe ogologo oge.

Ozi hoo!haa!! nwetara na-egosi na ọ bụ oge nne ya lọghachiri echi ya ka ọ kpọgara ya ụlọ ọgwụ, ebe e meziri ya ọgwụ maka àpà juru ya n’azụ.

Gọọmenti mba ahụ gụnyekwara na o nwere ụmụaka ndị ọzọ nọ oge nwatakịrị ahụ na-agabiga nrụsa ndị ahụ nile ma na anụkwa mkpu ákwá ya.

A dakwara ya nha Narị Pound ise (£500) ọ ga-akwụ nwa ya dịka ego iti aka n’obi, tinyekwara Narị Pound Abụọ na iri ise (£250) dịka nha ndị ọzọ.

Ọkaiwu kwuchitere ọnụ nwoke ahụ kwuru na o bughi n’obi ịrụsa nwa ya ahụ arụrụala, kama na ọ bụ adọm aka na ntị maka na ọ hapụrụ ịmụ akwụkwọ ya were nọrọ na-agba egwuregwu kọmputa.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close