NKE NA-EME UGBUA

ỤMAHÌ ABAKWAA APC MAKA ỊZỌ ỌKWA ONYEISIALA

–>

Abụja: Omenka Devidi Nweze Ụmahị, Aka na-achị Ebonyi Steeti ga-abanye ótù ndọrọndọrọ ọchịchị APC n’oge na-adịghị anya iji zọọ ọkwa Onyeisiala n’afọ 2023.

Ozi si n’aka ótù onye mara nke ékwé na-akụ n’okwe ndọrọndọrọ ọchịchị na Abụja na-ekwu na ụfọdụ ndị ndịsonwere APC nwere mmasị ikwado Ụmahị ma ọ bụrụ na ọ ga-abata APC.

Ụmahị, onye bụ Onyeisi oche ọgbakọ Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ so na ndị nwere mmasị ịzọ ọkwa Onyeisiala n’afọ 2023.

N’agbanyeghị na ọ no PDP, Ụmahị so na ndi ọchịchị n’Ala-Igbo ha na Onyeisiala Buharị dị na mma nke ukwuu.

Ọtụtụ na-etokwa ya maka mmepe pụrụ iche o wetaworo n’Ebonyi Steeti nke meziri ka Abakaliki, isi obodo Steeti ahụ ghọzịa “Lọndọnụ”

Ichie Aatọ̀ Eze, oke akajiakụ si Ukpo, Anambara Steeti bụ onye na-asụsụ Ụmahị ụzọ na APC.

Kepukepu hoo!haa!! nụrụ na – ekwu na Gọvanọ Ụmahị bizi ebi n’Abụja, ebe ọ na-azụ okwe ya maka afọ 2023.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close